To listen to the dialogue, click on the speaker icons.
To save the MP3 files to your computer, right click the speaker icon, click the "Save Target As. . ." menu item, then use the pop-up dialogue box to choose a location on your PC in which to store the file. Once it has downloaded, you can transfer the file to your MP3 player if you wish.
Description |
Resource |
Igbo Only (MP3)
(Poor recording) |
|
Documentation (PDF) |
|
Story
"Lee ụlọ a. Ọ bụ ụlọ Maazị Dike na nwunye ya. Maazi Dike bụ onye nkuzi. Nwunye ya na-arụ ọrụ n'otu ọfiisi ndị gọọmentị. Aha nwunye ya bụ Oriakụ Ngozika. Maazị Dike na nwunye ya bụ ndị ezigbo mmadụ. Onye ọ bụla maara ha n'obodo ha.
Ha mụrụ ụmụ isii. Ndị nwoke dị atọ, ndị nwaanyị dị atọ. Ụmụ ha etoola. Otu nọ na Yunivasiti, abụọ nọ n'ụlọakwụkwọ kọleji, abụọ nọ n'ụlọakwụkwọ praịmarị, otu nọ n'ụlọakwụkwọ ụmụọtaakara. Maazị Dike na nwunye ya na-akụziri ụmụ ha akwụkwọ oge niile. Ụmụ ha wee nwee ụbụrụisi akwụkwọ dị mma.
Ha na-akuzikwara ụmụ ha ezi omume na ihe gbasara omenala obodo ha. Ya mere ụmụ ha ji bụrụ ezigbo ụmụaka. Ha na-enyere nne ha na nna ha aka mgbe ọ bụla, tụmadị n'ihe gbasara ọrụ ubi. Ha na-ekele ekele, na-enyekwa ndị tọrọ ha ezi nsọpụrụ. Ndị mmadụ wee hụ ha n'anya nke ukwu.
Nke a mere ndị obodo ji hụ ezinaụlọ Maazị Dike n'anya nke ukwu. Ya merekwa Maazị Dike na oriakụ ya ji bụrụ ndị na-enwe obiụtọ mgbe niile." |
|